2 Samuel 22:29
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m, Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
2 Samuel 22:29 in English
2 Samuel 22:29 · Berean Standard Bible
For You, O LORD, are my lamp; the LORD lights up my darkness.
Context
27Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. 28Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala. 29Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,
Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. 31“Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke;
okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha.
Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.