2 Samuel 22:28
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.
2 Samuel 22:28 in English
2 Samuel 22:28 · Berean Standard Bible
You save an afflicted people, but Your eyes are on the haughty to bring them down.
Context
26“Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,
nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. 27Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,
ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. 28Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,
ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala. 29Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m,
Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. 30Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ;
sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.