2 Samuel 22:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
2 Samuel 22:19 in English
2 Samuel 22:19 · Berean Standard Bible
They confronted me in my day of calamity, but the LORD was my support.
Context
17“O sitere nʼelu setịpụ aka ya,
jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. 18Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,
bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. 19Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m.
Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere. 20Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,
Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. 21“Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị,
Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.