Native Bible

2 Kings 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.”

2 Kings 6:5 in English

2 Kings 6:5 · Berean Standard Bible

As one of them was cutting down a tree, the iron axe head fell into the water. “Oh, my master,” he cried out, “it was borrowed!”

Context

3Ma otu onye nʼime ha rịọrọ ya sị, “Biko, nna anyị ukwu, soronụ anyị.” O kwenyere na ọ ga-eso ha. 4O sonyekwara ha. Mgbe ha bịaruru nʼakụkụ Jọdan, ha malitere igbutu osisi. 5Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.” 6Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, “Ebee ka ọ dabara?” Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri. 7Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.