2 Ndị Eze 6:7
2 Kings 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya.
2 Kings 6:7 in English
2 Kings 6:7 · Berean Standard Bible
“Lift it out,” he said, and the man reached out his hand and took it.
Context
5Ma mgbe otu nʼime ha nọ na-egbutu otu osisi, anyụike ya dabara nʼime mmiri. O tiri mkpu sị, “Ewoo, onyenwe m. Ọ bụkwanụ ihe a rịọtara arịọta.” 6Mgbe ahụ, onye nke Chineke jụrụ ya sị, “Ebee ka ọ dabara?” Mgbe o ziri ya ebe ọ dabara, Ịlaisha gbutere osisi tụba ya nʼebe ahụ, mee ka anyụike ahụ segolite na-erugharị nʼelu mmiri. 7Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya. 8Nʼoge a, eze ndị Aram* na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.” 9Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel* ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.