Native Bible

2 Kings 6:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel* ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.”

2 Kings 6:9 in English

2 Kings 6:9 · Berean Standard Bible

Then the man of God sent word to the king of Israel: “Be careful passing by this place, for the Arameans are going down there.”

Context

7Ọ sịrị, “Tụtụlite ya.” O setịrị aka ya wepụta ya. 8Nʼoge a, eze ndị Aram* na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.” 9Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel* ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.” 10Nʼihi nke a, eze Izrel mere nchọpụta banyere ebe ahụ onye nke Chineke gwara ya. Ọtụtụ mgbe Ịlaisha dọrọ eze aka na ntị, nʼihi ya, ha nọrọ na nche nʼebe ahụ niile. 11Ihe ndị a mere ka iwe wee eze ndị Aram. Ọ kpọkọtara ndịisi ọrụ ya nye ha iwu sị, “Gwanụ m, onye nʼime anyị dịnyere eze Izrel?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.