Native Bible

2 Kings 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, eze Izrel mere nchọpụta banyere ebe ahụ onye nke Chineke gwara ya. Ọtụtụ mgbe Ịlaisha dọrọ eze aka na ntị, nʼihi ya, ha nọrọ na nche nʼebe ahụ niile.

2 Kings 6:10 in English

2 Kings 6:10 · Berean Standard Bible

So the king of Israel sent word to the place the man of God had pointed out. Time and again * Elisha warned the king, so that he was on his guard in such places.

Context

8Nʼoge a, eze ndị Aram* na ndị Izrel nọ nʼagha. Mgbe ya na ndịisi agha ya kparịtachara, ọ sịrị, “Aga m eguzobe ọmụma ụlọ ikwu m nʼebe dị otu a na nʼebe dị otu a.” 9Ngwangwa, onye nke Chineke zigaara eze Izrel* ozi sị, “Lezie anya, unu ejekwala nso nʼebe ahụ, nʼihi na eze Aram na ndị agha ya nọ nʼebe ahụ.” 10Nʼihi nke a, eze Izrel mere nchọpụta banyere ebe ahụ onye nke Chineke gwara ya. Ọtụtụ mgbe Ịlaisha dọrọ eze aka na ntị, nʼihi ya, ha nọrọ na nche nʼebe ahụ niile. 11Ihe ndị a mere ka iwe wee eze ndị Aram. Ọ kpọkọtara ndịisi ọrụ ya nye ha iwu sị, “Gwanụ m, onye nʼime anyị dịnyere eze Izrel?” 12Otu onye nʼime ndị ọchịagha ya sịrị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị, onyenwe m bụ eze. Ọ bụ Ịlaisha, onye amụma Izrel, bụ onye na-agwa eze Izrel okwu niile i na-ekwu nʼime ebe ndina gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.