Native Bible

2 Kings 14:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.

2 Kings 14:22 in English

2 Kings 14:22 · Berean Standard Bible

Azariah was the one who rebuilt Elath * and restored it to Judah after King Amaziah rested with his fathers.

Context

20Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid. 21Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya. 22Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. 23Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze. 24Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.