Native Bible

2 Kings 14:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie.

2 Kings 14:24 in English

2 Kings 14:24 · Berean Standard Bible

And he did evil in the sight of the LORD and did not turn away from all the sins that Jeroboam son of Nebat had caused Israel to commit.

Context

22Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. 23Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze. 24Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie. 25Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa. 26Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.