2 Ndị Eze 14:23
2 Kings 14:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze.
2 Kings 14:23 in English
2 Kings 14:23 · Berean Standard Bible
In the fifteenth year of the reign of Amaziah son of Joash over Judah, Jeroboam son of Jehoash became king of Israel, and he reigned in Samaria forty-one years.
Context
21Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya. 22Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. 23Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze. 24Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie. 25Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.