2 Ndị Eze 14:21
2 Kings 14:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya.
2 Kings 14:21 in English
2 Kings 14:21 · Berean Standard Bible
Then all the people of Judah took Azariah,* who was sixteen years old, and made him king in place of his father Amaziah.
Context
19Ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem, ọ gbapụrụ gbalaga Lakish. Ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ. 20Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid. 21Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya. 22Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. 23Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.