2 Ndị Eze 13:9
2 Kings 13:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya.
2 Kings 13:9 in English
2 Kings 13:9 · Berean Standard Bible
And Jehoahaz rested with his fathers and was buried in Samaria. And his son Jehoash * reigned in his place.
Context
7Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ. 8Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 9Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya. 10Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii. 11O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.