2 Ndị Eze 13:7
2 Kings 13:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ.
2 Kings 13:7 in English
2 Kings 13:7 · Berean Standard Bible
Jehoahaz had no army left, except fifty horsemen, ten chariots, and ten thousand foot soldiers, because the king of Aram had destroyed them and made them like the dust at threshing.
Context
5Onyenwe anyị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha.* Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga. 6Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria. 7Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ. 8Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 9Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.