2 Ndị Eze 13:8
2 Kings 13:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
2 Kings 13:8 in English
2 Kings 13:8 · Berean Standard Bible
As for the rest of the acts of Jehoahaz, along with all his accomplishments and his might, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Israel?
Context
6Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria. 7Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ. 8Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 9Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya. 10Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.