2 Ihe E Mere 29:11
2 Chronicles 29:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.”
2 Chronicles 29:11 in English
2 Chronicles 29:11 · Berean Standard Bible
Now, my sons, do not be negligent, for the LORD has chosen you to stand before Him, to serve Him, to minister before Him, and to burn incense.”
Context
9E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya. 10Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ. 11Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.” 12Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ:
site nʼikwu Kohat:
Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya;
nʼikwu Merari:
Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel;
nʼikwu Geshọn:
Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa; 13nʼikwu Elizafan:
Shimri, na Jeiel;
nʼikwu Asaf:
Zekaraya, na Matanaya;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.