2 Ihe E Mere 29:10
2 Chronicles 29:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ.
2 Chronicles 29:10 in English
2 Chronicles 29:10 · Berean Standard Bible
Now it is in my heart to make a covenant with the LORD, the God of Israel, so that His fierce anger will turn away from us.
Context
8Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ. 9E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya. 10Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ. 11Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.” 12Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ:
site nʼikwu Kohat:
Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya;
nʼikwu Merari:
Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel;
nʼikwu Geshọn:
Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.