Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku, Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”

1 Samuel 3:4 in English

1 Samuel 3:4 · Berean Standard Bible

Then the LORD called to Samuel, and he answered, “Here I am.”

Context

2O ruru nʼotu abalị, ka Elayị dinara ala nʼọnọdụ ya ịrahụ ụra, ebe ọ bụ na anya ya akala nka nke bụ na ọ dịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma. 3Mgbe ahụ, oriọna* Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. 4Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku, Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.” 5O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.” Ma Elayị sịrị ya, “Mba, akpọghị m gị, laghachi gaa dinaa ala.” Samuel gara dina ala. 6Ọzọkwa, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị, “Samuel!” Samuel gbaara ọsọ jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka m ga-eme?” Ma Elayị zara sị ya. “Mba akpọghị m gị oku, nwa m. Laghachi gaa dinaa ala.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.