1 Samuel 3:2
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ruru nʼotu abalị, ka Elayị dinara ala nʼọnọdụ ya ịrahụ ụra, ebe ọ bụ na anya ya akala nka nke bụ na ọ dịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma.
1 Samuel 3:2 in English
1 Samuel 3:2 · Berean Standard Bible
And at that time Eli, whose eyesight had grown so dim that he could not see, was lying in his room.
Context
1Nwata ahụ bụ Samuel nọkwa na-ejere Onyenwe anyị ozi nʼihu Elayị. Nʼụbọchị ndị ahụ okwu Onyenwe anyị dị ụkọ, adịghịkwa ahụ ọtụtụ ọhụ. 2O ruru nʼotu abalị, ka Elayị dinara ala nʼọnọdụ ya ịrahụ ụra, ebe ọ bụ na anya ya akala nka nke bụ na ọ dịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma. 3Mgbe ahụ, oriọna* Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. 4Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku,
Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.