Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.” Ma Elayị sịrị ya, “Mba, akpọghị m gị, laghachi gaa dinaa ala.” Samuel gara dina ala.

1 Samuel 3:5 in English

1 Samuel 3:5 · Berean Standard Bible

He ran to Eli and said, “Here I am, for you have called me.” “I did not call,” Eli replied. “Go back and lie down.” So he went and lay down.

Context

3Mgbe ahụ, oriọna* Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị. 4Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku, Samuel zara sị, “Lee m nʼebe a.” 5O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.” Ma Elayị sịrị ya, “Mba, akpọghị m gị, laghachi gaa dinaa ala.” Samuel gara dina ala. 6Ọzọkwa, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị, “Samuel!” Samuel gbaara ọsọ jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka m ga-eme?” Ma Elayị zara sị ya. “Mba akpọghị m gị oku, nwa m. Laghachi gaa dinaa ala.” 7Ma Samuel amatabeghị onye Onyenwe anyị bụ, ekpughebeghị okwu Onyenwe anyị nye ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.