Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.”

1 Samuel 28:7 in English

1 Samuel 28:7 · Berean Standard Bible

Then Saul said to his servants, “Find me a woman who is a medium, so I can go and consult her.” “There is a medium at Endor,” his servants replied.

Context

5Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya. 6Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma. 7Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.” 8Ya mere, Sọl nwogharịrị onwe ya, yiri uwe ọzọ, o ruo nʼabalị, ya na ndị ikom abụọ gakwuru nwanyị ahụ. Ọ sịrị, “Jụtara m mmụọ ase,* kpọlitekwara m onye m ga-akpọ aha ya.” 9Ma nwanyị ahụ sịrị ya, “Nʼezie gị onwe gị maara ihe Sọl mere. Ọ kwụsịla ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, na ndị dibịa afa site nʼala a. Nʼihi gịnị ka iji a gbara ndụ m ọnya, ime ka m nwụọ?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.