Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya.

1 Samuel 28:5 in English

1 Samuel 28:5 · Berean Standard Bible

When Saul saw the Philistine army, he was afraid and trembled violently.

Context

3Nʼoge a Samuel anwụọla, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, lie ya nʼobodo ya bụ Rema. Sọl achụpụsịakwala ndị niile na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase na ndị dibịa afa site nʼala ahụ. 4Ndị Filistia zukọtara, bịa maa ụlọ ikwu ha na Shunem, ebe Sọl na ndị Izrel niile zukọtakwara maa ụlọ ikwu ha na Gilboa. 5Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya. 6Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma. 7Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.” Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.