1 Samuel 28:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma.
1 Samuel 28:6 in English
1 Samuel 28:6 · Berean Standard Bible
He inquired of the LORD, but the LORD did not answer him by dreams or Urim * or prophets.
Context
4Ndị Filistia zukọtara, bịa maa ụlọ ikwu ha na Shunem, ebe Sọl na ndị Izrel niile zukọtakwara maa ụlọ ikwu ha na Gilboa. 5Mgbe Sọl hụrụ igwe ndị agha ndị Filistia, oke ụjọ jidere ya. 6Ọ jụrụ Onyenwe anyị ase, ma Onyenwe anyị azaghị ya. Ọ zaghị na nrọ, maọbụ site nʼUrim, maọbụ site nʼọnụ ndị amụma. 7Mgbe ahụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi, “Chọtara m nwanyị onye na-ajụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, ka m gakwuru ya jụta ya ase.”
Ha sịrị, “E nwere otu nwanyị dị otu a nʼEndoa.” 8Ya mere, Sọl nwogharịrị onwe ya, yiri uwe ọzọ, o ruo nʼabalị, ya na ndị ikom abụọ gakwuru nwanyị ahụ. Ọ sịrị, “Jụtara m mmụọ ase,* kpọlitekwara m onye m ga-akpọ aha ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.