1 Samuel 2:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.
1 Samuel 2:6 in English
1 Samuel 2:6 · Berean Standard Bible
The LORD brings death and gives life; He brings down to Sheol and raises up.
Context
4“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela
ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. 5Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri,
ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa.
Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa
ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. 6“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ,
ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. 7Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba;
ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. 8Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye
na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ.
Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ,
na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ.
“Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị
nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.