1 Samuel 2:4
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.
1 Samuel 2:4 in English
1 Samuel 2:4 · Berean Standard Bible
The bows of the mighty are broken, but the feeble are equipped with strength.
Context
2“O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị;
o nweghị onye dị karịa gị,
o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị. 3“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako,
ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile,
ya bụ onye na-anwale ọrụ niile. 4“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela
ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. 5Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri,
ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa.
Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa
ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. 6“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ,
ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.