Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.

1 Samuel 2:3 in English

1 Samuel 2:3 · Berean Standard Bible

Do not boast so proudly, or let arrogance come from your mouth, for the LORD is a God who knows, and by Him actions are weighed.

Context

1Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị: “Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị; nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi* m elu. Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m, nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị. 2“O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị; o nweghị onye dị karịa gị, o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị. 3“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako, ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile, ya bụ onye na-anwale ọrụ niile. 4“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. 5Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri, ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa. Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.