1 Samuel 17:28
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.”
1 Samuel 17:28 in English
1 Samuel 17:28 · Berean Standard Bible
Now when David’s oldest brother Eliab heard him speaking to the men, his anger burned against David. “Why have you come down here?” he asked. “And with whom did you leave those few sheep in the wilderness? I know your pride and wickedness of heart—you have come down to see the battle!”
Context
26Devid jụrụ ndị ikom nọ ya nso, “Gịnị ka a ga-emere nwoke ga-etigbu onye Filistia a, meekwa ka mkparị a ghara ịdịrị Izrel ọzọ? Onye ka onye Filistia a a na-ebighị ugwu bụ, na ọ ga-apụta na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ?” 27Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya. 28Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.” 29Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?” 30Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.