Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya.

1 Samuel 17:27 in English

1 Samuel 17:27 · Berean Standard Bible

The people told him about the offer, saying, “That is what will be done for the man who kills him.”

Context

25Ndị Izrel sịrị, “Unu hụrụ nwoke a na-eguzo onwe ya? Ọ bụ ka ọ kparịa nnọọ ndị Izrel ka o ji apụta? Eze kwere nkwa inye onye ọbụla ga-etigbu ya akụ nʼebe ọ bara ụba. Ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, meekwa ka ndị ezinaụlọ onye ahụ gharakwa ịtụ ụtụ taks ọzọ nʼIzrel!” 26Devid jụrụ ndị ikom nọ ya nso, “Gịnị ka a ga-emere nwoke ga-etigbu onye Filistia a, meekwa ka mkparị a ghara ịdịrị Izrel ọzọ? Onye ka onye Filistia a a na-ebighị ugwu bụ, na ọ ga-apụta na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ?” 27Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya. 28Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.” 29Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.