Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?”

1 Samuel 17:29 in English

1 Samuel 17:29 · Berean Standard Bible

“What have I done now?” said David. “Was it not just a question?”

Context

27Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya. 28Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.” 29Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?” 30Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ. 31Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.