1 Samuel 17:30
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ.
1 Samuel 17:30 in English
1 Samuel 17:30 · Berean Standard Bible
Then he turned from him toward another and asked about the offer, and those people answered him just as the first ones had answered.
Context
28Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.” 29Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?” 30Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ. 31Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya. 32Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.