1 Samuel 17:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha.
1 Samuel 17:21 in English
1 Samuel 17:21 · Berean Standard Bible
And Israel and the Philistines arrayed in formation against each other.
Context
19Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha. 20Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha. 21Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha. 22Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha. 23Ma mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, onye mmeri nʼọgbọ agha, onye Filistia nke Gat, Golaịat bụ aha ya, sitere nʼusoro ndị agha Filistia pụta, kwuokwa okwu niile ahụ dịka ọ na-ekwu na mbụ. Devid nụrụ ihe o kwuru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.