1 Samuel 17:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha.
1 Samuel 17:19 in English
1 Samuel 17:19 · Berean Standard Bible
They are with Saul and all the men of Israel in the Valley of Elah, fighting against the Philistines.”
Context
17Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha. 18Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi,* ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị* natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.” 19Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha. 20Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha. 21Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.