Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi,* ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị* natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.”

1 Samuel 17:18 in English

1 Samuel 17:18 · Berean Standard Bible

Take also these ten portions of cheese to the commander of their unit. Check on the welfare of your brothers and bring back an assurance from them.*

Context

16Golaịat, onye Filistia na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ. 17Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha. 18Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi,* ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị* natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.” 19Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha. 20Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.