1 Samuel 15:32
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.” Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.”
1 Samuel 15:32 in English
1 Samuel 15:32 · Berean Standard Bible
Then Samuel said, “Bring me Agag king of the Amalekites.” Agag came to him cheerfully,* for he thought, “Surely the bitterness of death is past.”*
Context
30Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị Chineke gị ofufe.” 31Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye Onyenwe anyị. 32Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.”
Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.” 33Ma Samuel kwuru sị,
“Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụ
otu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.”
Samuel gburu Agag nʼihu Onyenwe anyị na Gilgal. 34Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.