1 Samuel 15:31
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye Onyenwe anyị.
1 Samuel 15:31 in English
1 Samuel 15:31 · Berean Standard Bible
So Samuel went back with Saul, and Saul worshiped the LORD.
Context
29Chineke, onye bụ Ebube Izrel, anaghị agha ụgha; ọ nakwaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị mmadụ efu!” 30Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị Chineke gị ofufe.” 31Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye Onyenwe anyị. 32Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.”
Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.” 33Ma Samuel kwuru sị,
“Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụ
otu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.”
Samuel gburu Agag nʼihu Onyenwe anyị na Gilgal.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.