1 Samuel 15:34
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya.
1 Samuel 15:34 in English
1 Samuel 15:34 · Berean Standard Bible
Then Samuel went to Ramah, but Saul went up to his home in Gibeah of Saul.
Context
32Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.”
Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.” 33Ma Samuel kwuru sị,
“Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụ
otu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.”
Samuel gburu Agag nʼihu Onyenwe anyị na Gilgal. 34Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya. 35Site nʼoge ahụ ruo mgbe Samuel nwụrụ, ọ hụkwaghị Sọl anya ọzọ. Ma o rugidere ụjụ nʼihi Sọl oge ndị a niile. O wutekwara Onyenwe anyị na o mere Sọl eze ndị Izrel.
15:2 Onye pụrụ ime ihe niile
15:3 Gbuchapụ ihe niile nke a, nʼokwu ndị Hibru pụtara i were ihe niile, tinyere mmadụ na anụ ụlọ, nyefee Onyenwe anyị kpamkpam na-eleghị anya nʼazụ site ikpochapụ ha. Usoro okwu a dịkwa nʼamaokwu ndị a: 1Sa 15:8,9,15,18,20,21
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.