1 Ndị Eze 9:14
1 Kings 9:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
1 Kings 9:14 in English
1 Kings 9:14 · Berean Standard Bible
And Hiram had sent the king 120 talents of gold.*
Context
12Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya. 13Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul,* aha ọ na-aza ruo taa. 14Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ. 15Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza. 16Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.