Native Bible

1 Kings 9:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza.

1 Kings 9:15 in English

1 Kings 9:15 · Berean Standard Bible

This is the account of the forced labor that King Solomon imposed to build the house of the LORD, his own palace, the supporting terraces,* and the wall of Jerusalem, as well as Hazor, Megiddo, and Gezer.

Context

13Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul,* aha ọ na-aza ruo taa. 14Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ. 15Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza. 16Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ. 17Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.