Native Bible

1 Kings 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon,

1 Kings 9:17 in English

1 Kings 9:17 · Berean Standard Bible

So Solomon rebuilt Gezer, Lower Beth-horon,

Context

15Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza. 16Fero eze Ijipt buru agha na mbụ merie Gaza, kpọọ ya ọkụ, gbukwaa ọtụtụ ndị Kenan bi nʼobodo ahụ, were ya nye nwa ya nwanyị, bụ nwunye Solomọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ. 17Solomọn wugharịrị obodo Gaza, wuokwa ndịda Bet-Horon, 18Baalat na Tadmọ* nke dị nʼọzara nʼime ala ya. 19O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.