1 Ndị Eze 4:8
1 Kings 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ. Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem.
1 Kings 4:8 in English
1 Kings 4:8 · Berean Standard Bible
and these were their names: Ben-hur in the hill country of Ephraim;
Context
6Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze.
Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye. 7Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ. 8Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ.
Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem. 9Ben-Deka, onye na-achị Makaz, na Shaalbim na Bet-Shemesh, na Elọn Bethanan. 10Ben-Hesed, onye na-achị Arubot, na Soko, na Ala Hefa niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.