1 Ndị Eze 4:7
1 Kings 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ.
1 Kings 4:7 in English
1 Kings 4:7 · Berean Standard Bible
Solomon had twelve governors over all Israel to provide food for the king and his household. Each one would arrange provisions for one month of the year,
Context
5Azaraya nwa Netan bụ onyeisi na-elekọta ndị na-ejere eze ozi.
Zabud nwa Netan bụ onye nchụaja na onye ndụmọdụ nye eze. 6Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze.
Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye. 7Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ. 8Nke a bụ aha ndị ikom iri na abụọ ahụ.
Ben-Hua, onye na-achị ala ugwu ugwu Ifrem. 9Ben-Deka, onye na-achị Makaz, na Shaalbim na Bet-Shemesh, na Elọn Bethanan.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.