1 Ndị Eze 20:36
1 Kings 20:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.*
1 Kings 20:36 in English
1 Kings 20:36 · Berean Standard Bible
Then the prophet said to him, “Because you have not obeyed the voice of the LORD, as soon as you depart from me a lion will kill you.” And when he left, a lion found him and killed him.
Context
34Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.”
Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo. 35Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru. 36Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.* 37Onye amụma ahụ pụkwara chọta onye ọzọ sị ya, “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ tiri ya ihe tihịa ya ahụ. 38Mgbe ahụ, onye amụma ahụ e tiri ihe jiri akwa kechie ihu ya, ka mmadụ ọbụla ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ pụrụ gaa guzo nʼakụkụ ụzọ ebe eze Izrel ga-esi gafee.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.