1 Ndị Eze 20:38
1 Kings 20:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, onye amụma ahụ e tiri ihe jiri akwa kechie ihu ya, ka mmadụ ọbụla ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ pụrụ gaa guzo nʼakụkụ ụzọ ebe eze Izrel ga-esi gafee.
1 Kings 20:38 in English
1 Kings 20:38 · Berean Standard Bible
and the prophet went and waited on the road for the king, disguising himself with a bandage over his eyes.
Context
36Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.* 37Onye amụma ahụ pụkwara chọta onye ọzọ sị ya, “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ tiri ya ihe tihịa ya ahụ. 38Mgbe ahụ, onye amụma ahụ e tiri ihe jiri akwa kechie ihu ya, ka mmadụ ọbụla ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ pụrụ gaa guzo nʼakụkụ ụzọ ebe eze Izrel ga-esi gafee. 39Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ,* ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’ 40Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.”
Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.