1 Ndị Eze 20:40
1 Kings 20:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.” Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.”
1 Kings 20:40 in English
1 Kings 20:40 · Berean Standard Bible
But while your servant was busy here and there, the man disappeared.” And the king of Israel said to him, “So shall your judgment be; you have pronounced it on yourself.”
Context
38Mgbe ahụ, onye amụma ahụ e tiri ihe jiri akwa kechie ihu ya, ka mmadụ ọbụla ghara ịmata onye ọ bụ. Ọ pụrụ gaa guzo nʼakụkụ ụzọ ebe eze Izrel ga-esi gafee. 39Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ,* ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’ 40Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.”
Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.” 41Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma. 42Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.