1 Ndị Eze 20:41
1 Kings 20:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma.
1 Kings 20:41 in English
1 Kings 20:41 · Berean Standard Bible
Then the prophet quickly removed the bandage from his eyes, and the king of Israel recognized him as one of the prophets.
Context
39Mgbe eze na-agafe, onye amụma ahụ tiri mkpu sị, “Onyenwe m, biko gee m ntị. Lee, otu onye agha bịakwutere m mgbe m nọ nʼihu agha sị m, ‘Lee nwoke a a dọtara nʼagha; chee ya nche. Ekwekwala ka ọ gbanarị gị. Nʼihi na ọ bụrụ na o site nʼaka gị gbapụ,* ị ga-anwụ, maọbụ i jiri otu talenti ọlaọcha gbara isi gị.’ 40Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.”
Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.” 41Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma. 42Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’ ” 43Nʼihi okwu a, eze Izrel ji iwe na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya dị na Sameria.
20:10 1Ez 19:2; 2Ez 6:31
20:13 1Ez 20:28
20:36 1Ez 13:24.
20:39 2Ez 10:24
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.