Native Bible

1 Kings 20:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’ ”

1 Kings 20:42 in English

1 Kings 20:42 · Berean Standard Bible

And the prophet said to the king, “This is what the LORD says: ‘Because you have let slip from your hand the man I had devoted to destruction,* your life will be exchanged for his life, and your people for his people.’”

Context

40Ma mgbe m nọ na-arụ ọrụ ọzọ, nwoke ahụ a dọtara nʼagha gbapụrụ. Ahụkwaghị m ya anya ọzọ.” Mgbe ahụ, eze Izrel zara sị ya, “I jirila ọnụ gị maa onwe gị ikpe. Ị ghaghị ịnata ahụhụ dịrị gị.” 41Mgbe ahụ, onye amụma ahụ mere ngwangwa wepụ akwa ahụ o ji kechie anya ya abụọ. Eze Izrel matakwara na ọ bụ otu onye nʼime ndị amụma. 42Onye amụma ahụ gwara eze okwu sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ebe i mere ka nwoke a laa, bụ onye m nyere gị nʼaka ime ka ọ nwụọ, ugbu a, ị ghaghị ịnwụ nʼọnọdụ ya. A ga-alakwa ndị gị nʼiyi, nʼọnọdụ ndị nke ya.’ ” 43Nʼihi okwu a, eze Izrel ji iwe na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya dị na Sameria. 20:10 1Ez 19:2; 2Ez 6:31 20:13 1Ez 20:28 20:36 1Ez 13:24. 20:39 2Ez 10:24

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.