Native Bible

1 Kings 20:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru.

1 Kings 20:35 in English

1 Kings 20:35 · Berean Standard Bible

Meanwhile, by the word of the LORD, one of the sons of the prophets said to his companion, “Strike me, please!” But the man refused to strike him.

Context

33Okwu a mere ka ndị ozi eze Aram nwee olileanya. Ha mere ngwangwa kwugharịakwa ihe ahụ o kwuru. Ha sịrị, “E, Nwanne gị bụ Ben-Hadad.” Mgbe ahụ, eze Ehab nyere ha iwu sị, “Gaanụ kpọpụta ya, dutekwanụ ya nʼebe a.” Mgbe Ben-Hadad bịara, Ehab mere ka ọ rigota nʼụgbọ agha nke ya. 34Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo. 35Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru. 36Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.* 37Onye amụma ahụ pụkwara chọta onye ọzọ sị ya, “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ tiri ya ihe tihịa ya ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.