Native Bible

1 Kings 20:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo.

1 Kings 20:34 in English

1 Kings 20:34 · Berean Standard Bible

Ben-hadad said to him, “I will restore the cities my father took from your father; you may set up your own marketplaces in Damascus, as my father did in Samaria.” “By this treaty * I release you,” Ahab replied. So he made a treaty with him and sent him away.

Context

32Ya mere, ha yikwasịrị onwe ha akwa mkpe, nyarakwa ụdọ nʼolu ha, jekwuru eze Izrel sị ya, “Ohu gị bụ Ben-Hadad na-asị, ‘Biko, kwee ka m dịrị ndụ.’ ” Eze jụrụ ha sị, “Ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ ugbu a? Nwanne m ka ọ bụ.” 33Okwu a mere ka ndị ozi eze Aram nwee olileanya. Ha mere ngwangwa kwugharịakwa ihe ahụ o kwuru. Ha sịrị, “E, Nwanne gị bụ Ben-Hadad.” Mgbe ahụ, eze Ehab nyere ha iwu sị, “Gaanụ kpọpụta ya, dutekwanụ ya nʼebe a.” Mgbe Ben-Hadad bịara, Ehab mere ka ọ rigota nʼụgbọ agha nke ya. 34Mgbe ahụ, Ben-Hadad gwara Ehab sị, “Obodo niile nke nna m naara nna gị, ka m ga-enyeghachi gị. I nwere ike iwuru onwe gị ọdụ ahịa nʼama obodo Damaskọs dịka nna m wuru nʼime Sameria.” Ehab kwuru, “Ọ bụrụ na anyị agbaa ndụ, aga m eme ka i nwere onwe gị.” Ya mere, ha abụọ gbara ndụ. Ehab hapụkwara ya ka ọ laa nʼudo. 35Emesịa, okwu Onyenwe anyị rutere otu onye nʼetiti ụmụ ndị amụma. Ọ gwara otu nwoke nʼime ụmụ ndị amụma ahụ nọ ya nso sị ya, “Jiri ngwa agha dị gị nʼaka tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ ime ihe onye amụma ahụ kwuru. 36Nʼihi nke a, onye amụma gwara nwoke ahụ okwu sị, “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ime ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu, lee ihe ga-adakwasị gị. Mgbe i si nʼebe a na-ala nʼụlọ gị, ọdụm ga-ezute gị nʼụzọ dọgbuo gị.” Amụma a mezukwara, nʼihi na mgbe nwoke ahụ tụgharịrị si nʼebe ahụ na-ala, ọdụm lụsoro ya ọgụ nʼụzọ gbuo ya.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.