Native Bible

1 Kings 20:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso,* otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.”

1 Kings 20:10 in English

1 Kings 20:10 · Berean Standard Bible

Then Ben-hadad sent another message to Ahab: “May the gods deal with me, and ever so severely, if enough dust remains of Samaria for each of my men to have a handful.”

Context

8Ndị okenye na ndị Izrel zara sị ya, “Aṅala ya ntị! Enyela ya ihe ọbụla.” 9Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru. 10Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso,* otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.” 11Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ” 12Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.