1 Ndị Eze 20:11
1 Kings 20:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ”
1 Kings 20:11 in English
1 Kings 20:11 · Berean Standard Bible
And the king of Israel replied, “Tell him: ‘The one putting on his armor should not boast like one taking it off.’”
Context
9Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị ozi Ben-Hadad, “Gwanụ onyenwe m, bụ eze, ‘M bụ odibo gị jikeere ime ihe niile ị buru ụzọ kwuo na m ga-enye gị. Ma ekwenyeghị m nʼozi nke ugboro abụọ a.’ ” Ndị ozi ahụ laghachiri kọọrọ Ben-Hadad ihe niile Ehab kwuru. 10Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso,* otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.” 11Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ” 12Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha. 13Nʼoge a, otu onye amụma bịakwutere Ehab, bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị hụrụ oke igwe ndị agha a? Aga m enyefe ha nʼaka gị taa, mgbe ahụ ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.