1 Ndị Eze 20:12
1 Kings 20:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha.
1 Kings 20:12 in English
1 Kings 20:12 · Berean Standard Bible
Ben-hadad received this message while he and the kings were drinking in their tents,* and he said to his servants, “Take your positions.” So they stationed themselves against the city.
Context
10Ma Ben-Hadad zigakwaara Ehab ozi ọzọ sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso,* otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na aja Sameria ga-afọdụ inye onye ọbụla nʼetiti ndị ikom m otu njuaka.” 11Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ” 12Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha. 13Nʼoge a, otu onye amụma bịakwutere Ehab, bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị hụrụ oke igwe ndị agha a? Aga m enyefe ha nʼaka gị taa, mgbe ahụ ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”* 14Ma Ehab jụrụ sị, “Onye ga-eme nke a?”
Onye amụma zara, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụ ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel.’ ”
Ehab jụkwara ọzọ, “Onye ga-amalite agha a?”
Onye amụma ahụ zara, “Gị onwe gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.